Ndị ndu obodo ga-adụ ndụmọdụ ikpebi otu esi eme ka ndị otu nwete oriri nsọ ọ dịkarịa otu ugboro n’otu ọnwa
Ndị otu Ndị isi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ nke Nkuzọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a zigara akwụkwọ ozi a sotere na Mach 12, 2020, nye ndị otu Nzukọ nsọ gburugburu ụwa.
Ezi Ụmụnne ndi Nwoke na ndi Nwanyị,
Dịka anyị kwere nkwa n’ime akwụkwọ ozi anyị nke Mach 11, 2020, anyị na-aga n’ihu inyochaa mgbanwe ọnọdụ niile gbasara COVID-19 gburugburu ụwa. Anyị atụlewo ndụmọdụ nke ndị ndu Nzukọ nsọ n’obodo, ndị ụlọ ọrụ gọvamentị na ndị ọrụ ahụike, ma achọtawo odudu nke Onyenwe-anyị banyere mkpa ndịa niile. Ugbua anyị na-ewete odudu ndị emelitere.
Ibido n’egbughị oge, nchịkọta ọha niile nke ndị otu Nzukọ nsọ ka akwụsịtụrụ nwa oge gburugburu ụwa ruo mgbe ekwupụtara n’ihu. Nke a gụnyere:
- Ọgbakọ Stek niile, ọgbakọ otu ndị ndu niile na nnukwu nchịkọta niile ndị ọzọ
- Ife ofufe nke ọha niile, gụnyekọta nzukọ oriri nsọ niile
- Mmemme niile nke ngalaba nta, ngalaba ukwu na nke stek
Ebe ọ kwere, biko mee nzukọ niile ọbụla dị mkpa nke ndị ndu site n’igwe teknụzụ. Ajụjụ ndị pụrụiche ka enwere ike iwegara ndi ndu ọkwa-nchụ-aja nke obodo. Nduzi ndị ọzọ banyere okwu ndị ọzọ niile ka a ga-ewete.
Ndị Bishọp kwesịrị ịdụ ndụmọdụ ha na onyeisi stek ikpebi otu esi eme ka ndị otu nwete oriri nsọ ọ dịkarịa otu ugboro n’otu ọnwa
Anyị na-agba ndị otu ume na mgbalị ije ozi nlekọta ha ilekọta maka onye ọbụla n’ibe ya. Anyị kwesịrị isoro ọmụmatụ nke Onye Nzọpụta ịgọzi ma bulie ndị ọzọ.
Anyị na-agba aka ebe anyị nke ịhụnanya nke Onye-nwe-anyị n’oge a nke amaghị ama. Ọ ga-agọzi unu ịchọta ọńụ dị ka unu n’eme ihe unu makarịsịrị iji bie ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst n’ime ọnọdụ niile.
n’Eziokwu,
Ndị otu Ndị isi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ